Onye ebezina na uju na oga adinma
Onye echezina maka na echi nabia
di ime oweghi onye ma ihe oga amu
obu nwoke ma nwa nwayi oma
Jiri ndidi sowe uwa na oga adinma
Efi na eweghi odudu obu chi ya na
Achuro ya ijiji na ahu ya oge nile.
Onye ejila ugobe nke ndu ya na aka ya
Make uwa bu nke na akpa onye ya yo ba chukwu
Maka na emesia na oga adinma kpebere obasi
Mezie onwe gi emezi maka echi na abia abia,
Ifeoma di niro onye elela anya na azu.
Le ka umununu si agba egwu na elugwe
Le ka ndi ekwe na akopu onu ha nile
Lekwa ka elugwe na eluwa si buru enyi ugbua
Okuko na Efi na Mbe na akparita uka na udo
Maka na ifeoma ka ha nile nacho na uwa.
Ebezina na chukwu no nso
Ficha anya gi na ifeoma na abia
Ifeoma di niro, nke di iro ka nma
Ogazi amaka ejiri ya ago mmuo
Oweghi ihe na adigidi na eluwa
Mezie owegi emezi na oga adinma.
Categories:
amu, africa,
Form: Blank verse
MADU BU AJA
Uwa eweghi isi na odu
Uwa abughi nke madu
Madu bu aja na uwa a
Ihe obula i were abughi nke gi
Emesia iga ahapuha wee la
Ya mere, du owegi odu na
Madu bu aja na ntu.
Osogi wee igwe na ala
Osogi wee ulo elu na nke ala
Osogi gba ugbo elu na nke ala
Marakwa na madu na anwu anwu
Marakwa na madu bu aja
Ya mere wedata obi gi na ala echidime.
Madu bu aja na ntu
Madu abaghi uru na uwaa
Echidime oweghi onye ma ihe oga amu
Ye mere du owegi odu
Madu bu aja na ntu.
Categories:
amu, africa, art,
Form: Blank verse
Ezigbo enyim nwoke bia ka anyi noro
Na ofu obi na ofu nhota ihe uwa a bu.
Ezigbo enyi nwoke bia ka enyi tinye
Aka ru sia obodo anyi bu Nigeria.
Ezigbo enyi nwoke egbula m
Igbuo m gini ga abu uru gi na uwa a,
Bia ka anyi jiri otu obi biri maka na
Otu obi ga eme ka obodo anyi ka nihu.
Jide aka m ka m jide nke gi,
Ebukwala ihe na obi ebe m no,
Werem ka nwanne gi ka anyi no di.
Ezigbo enyim nwoke, akujokwalam
Akutokwalam na azu maka ego.
Echi di ime, ezigbo enyi m nwoke,
Onweghi onye ma ihe echi ga amu;
Nwoke mabu nwayi, ka anyi chebe ihe echi ga abu.
Ezigbo enyi m nkwoke ka anyi jiri out obi biri na udo.
Categories:
amu, africa,
Form: Ballad