Ezigbo Enyi M Nwoke
Ezigbo enyim nwoke bia ka anyi noro
Na ofu obi na ofu nhota ihe uwa a bu.
Ezigbo enyi nwoke bia ka enyi tinye
Aka ru sia obodo anyi bu Nigeria.
Ezigbo enyi nwoke egbula m
Igbuo m gini ga abu uru gi na uwa a,
Bia ka anyi jiri otu obi biri maka na
Otu obi ga eme ka obodo anyi ka nihu.
Jide aka m ka m jide nke gi,
Ebukwala ihe na obi ebe m no,
Werem ka nwanne gi ka anyi no di.
Ezigbo enyim nwoke, akujokwalam
Akutokwalam na azu maka ego.
Echi di ime, ezigbo enyi m nwoke,
Onweghi onye ma ihe echi ga amu;
Nwoke mabu nwayi, ka anyi chebe ihe echi ga abu.
Ezigbo enyi m nkwoke ka anyi jiri out obi biri na udo.
Copyright © John Chizoba Vincent | Year Posted 2015
Post Comments
Poetrysoup is an environment of encouragement and growth so only provide specific positive comments that indicate what you appreciate about the poem. Negative comments will result your account being banned.
Please
Login
to post a comment