Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma
Chuka Nnabuife: Nwoke Na Mma
(Ab? p?r? iche maka mmemme ncheta ?gb?gba ah? iri ise nke Sa Chuka Nnab?ife)
Izunna Okafor dere ab? a
A s? na mma nwoke b? mpempe akw?kw?
Mana nke ah? b? maka nd? ?j? akw?kw?
Maka na onye g?t? akw?kw?, ma o kwegh? ya
Mgbe ah?, ? s? ka ? ga bute ego
Maka na ? kpazie ya aka n'?n?, ? s? na ego b? mma nwoke
?f?d? s?kwa na ogologo imi b? mma nwoke
Mana nke ah? b? maka nd? j?tara ?n? ha
Onye lechaa onwe ya n'enyo, h? na ? d? ka isi mkpi
Mgbe ah?, o cheta na ogologo imi b? mma nwoke
Maka na ya onwe ya b? ?s? ohu imi
Nd? ?ka s?kwa na mma nwoke b? n'af? ?n?
N'ihi na ha onwe d?ka ihu mm??
Ego kwàrà ha, ogologo imi erugh?kwa ha aka.
Ha wee ghàdozie aka n'af? ?n?
We kwubezie na af? ?n? b? mma nwoke
N'ime ihe nd? a niile
Nke b? eziokwu b? na ?ha obodo maara mm?? ka ukwu
Maka na e jigh? nkume elele isi kara aka
Ngàla nwa ebuli b? n'ihe chi ya jiri g?z?e
Mana ka m mme ka ? mara
O nwere otu nwoke nwere ihe nd? a niile
? b? maaz? Chuka Nnab?ufe
? b?gh? naan? na ? g?r? akw?kw?
Kama ogologo imi ya ha ka nke ele
Af? ?n? ya hakwa ka nke ag?
Mpe mpe akw? na-esi juputakwara n'akpa ya
Maka na a s? onye ji ya ruru ab??, ya gwuru
Lekene nwoke na mma
? b? ogologo o toro ka ?n? nkw?
Ka ? b?z? ?t?t? akara chi jiri g?zie ya
Nd? be any?, a na-eked? oke ji n'az? ?ba?
? ch?? ya n'?gba mb?, ? h? ya
? ch?? ya n'ise ihe, ? h? mkp?s? aka ya
? nwaa ya n'egwu, ? h? na ? b? keleke
? ch?zie ya n'ihe odide, ? h? na ya na Achebe b? ofu nne
?r? mgbasa ozi b?z?kwaara ya mmiri ?ñ?ñ?
Af? ?ma ya na-akp? n'ala ka nne eke
? b? nwoke maara ezi okwu
?g?g? isi b?kwaara uhie ?n?
Oge ?b?la, ihu na-at? ya am? ka ?k?r? nnewi
Maka na ? gh?tara n'elu ?wa d?ka ah?a otu
N'ihi ya keduz? ihe mmad? na-echegburu onwe ya.
Nd? be any?, keduz? ebe any? ga-ebido wee g?s?ba
? b? nd? o mere eme ka ? b? nd? ? ka na-eme eme
? b? na nd? o buru p?ta ?wa
Ka ? b? na nd? ? r?taara onwe ya
N'eziokwu, a d?gh? ama ?garanya n'af? nto
Maka na oke ji n'abala ad?gh? az? ihu ?ba
Maaz? Chuka b? oke nwoke
Ka m ka gbado ya ebe a maka mgbe ?z?
Maka na oke mm?? n?kar?a n'?gb?
?m??kp? ekenye ya ?t?
©Izunna Okafor, 2018
Copyright © Izunna Okafor | Year Posted 2020
Post Comments
Poetrysoup is an environment of encouragement and growth so only provide specific positive comments that indicate what you appreciate about the poem. Negative comments will result your account being banned.
Please
Login
to post a comment