Anyammiri Ala Anyi
Anyammiri Ala Any?
(Tears of Our Land)
Izunna Okafor dere ab? a
Ala Na?jiria ebegbuo onwe ya n'akwa
Anya mmiri anya mmiri ebe niile
Akwa ?t?t?, akwa ndeeri na akwa ar?r?
?nye ga-az? ala any? ?
Chi ?b?b? were aka ekpe were dup?ta ya ?ra
Chi ?j?? ewere akwa ar?r? dúbàà ya
Ihe na-eben? aka na-ebekwa
Onye ga-az? ala any? ?
Na?jiria b? nne ch? ?m?
Nd? ?ch?ch? b? di bi ?l?
Nne na nwa ebegbuo onwe ha n'akwa
Ag??, anya mmiri, akwa ar?r? ebe niile
Onye ga-az? ala any? ?
Lekene nwaany? na mma ya
Na ?bara ?m? chi jiri g?zie af? ya
Ma di ya ekwegh? ka o rite ihe nwa ya
Wee na-am? ya ?bara ka anw?nta Nnewi
Onye ga-az? ala any? ?
Ezi na ?l? ya n? n'?gbaghara
Ma di ya ad?gh? emez? ka nwoke
Egbe ebuk?chaala ?m? ya na Benue, Dapchi na Chibok
Ma di ya ekwugh? ihe ?b?la ma ?l?
D?ka a gà-as? na ? macha ihe na-eme
Onye ga-az? ala any? ?
Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ?n? nri
?m?ka n?z?kwa n'ag??, ?b?nad? n'ikpo nri ha nwèrè
Ya b? ògòlì nwaany? agbaa isi aw? na-erugh? eru
Anya mmiri ejugokwa ?g?d? ya
Onye ga-az? ala any? ?
Nwoke ah? agbaala ya ?t? n'?mà ah?a
Cha? !
Ag? nwaany? ebegbuo onwe ya n'akwa !!
D?ka ?wa na-agbáz?kwa ?t? ya elele
Ùgwù e jiri mara ya erugh?z?kwa ya aka
Onye ga-az? ala any? ?
Ala Na?jiria na-ach? dí ?z? ugbu a
Nd? ? l?r? al? aghar?p?chaala ya
N'ihi ezugh? oke n'ihe e ji nwoke eme
Nke b? isi anagh? echètekwuz?kwa onwe ya
N'ihi ?b?r? ?ta nchara
Na ihe a gw?r? agw? so ya
Onye ga-ach? ala any? ?
Iwe eweela ?m? ya nd? okenye
Ha ji ach?r? nne ha di ?z? n'oge
Naan? nwoke nwere ùgwù na ns?p?r?
Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ?b?ch? ah?
Ma e wepuchaa úgwùmágànà na nd? otu ya.
A j?? m ?n?, onye ga-az? ala any? ?
G? onwe g? sòrò b?r? nwa ya
M? onwe m sòrò b?r? nwa ya
Ng?ga d? n'?k? ab?gh? nkè az?
? b?r? nkè an?
?m?nne m a j?? m ?n? ?z?
Onye ga-al? mma any? ?
Oke ji na àbàlà ? na-az? ihu ?ba ?
Ngwa jikere ma chemie echiche nke ?ma
Ka i wee sòró any? zaa aj?j? ah? n'oke ?b?ch? ah?
Onye ga-ach? ala any? ?
Maka Onye Dere Ab? A:
Izunna Okafor b? nwaaf? Ebenat?r d? n'okpuru ?ch?ch? Nnewi Saw?t? nke steeti Anambra. ? b? onye edemede iduaz? na ab?, onye nta ak?k? na onye nkwàlite as?s? Igbo. ? g?r? na mahadum Nnamd? Azikiwe d? n'Awka, b? ebe o mere maka ihe ?m?m? nhazi ?hanaeze b? 'Public Administration' n'olu bekee.
Izunna na-ede akw?kw? n'as?s? Igbo na n'as?s? bekee, ma b?r?kwa onye e jìrì ?kwàlìtè as?s? na omenala Igbo wee mara.
Copyright © Izunna Okafor | Year Posted 2020
Post Comments
Poetrysoup is an environment of encouragement and growth so only provide specific positive comments that indicate what you appreciate about the poem. Negative comments will result your account being banned.
Please
Login
to post a comment