Ezigbo enyim nwoke bia ka anyi noro
Na ofu obi na ofu nhota ihe uwa a bu.
Ezigbo enyi nwoke bia ka enyi tinye
Aka ru sia obodo anyi bu Nigeria.
Ezigbo enyi nwoke egbula m
Igbuo m gini ga abu uru gi na uwa a,
Bia ka anyi jiri otu obi biri maka na
Otu obi ga eme ka obodo anyi ka nihu.
Jide aka m ka m jide nke gi,
Ebukwala ihe na obi ebe m no,
Werem ka nwanne gi ka anyi no di.
Ezigbo enyim nwoke, akujokwalam
Akutokwalam na azu maka ego.
Echi di ime, ezigbo enyi m nwoke,
Onweghi onye ma ihe echi ga amu;
Nwoke mabu nwayi, ka anyi chebe ihe echi ga abu.
Ezigbo enyi m nkwoke ka anyi jiri out obi biri na udo.
Categories:
biri, africa,
Form: Ballad