Nnem Amaka
NNEM AMAKA
Nnem amaka,
Nnem bu udala mmicha,
Ukwu nwanyi Owerri;
O bu ihe madu nile na eri.
Nnem bu ukwu nnu na mmanu anu.
Ezigbo nwayi oma na ala ezigbo,
Pino-pino nwa na ala igbo,
ukpara na eti mmanwu.
Obukwa kpakpandu elu igwe,
Utara dachiri olu umuokoro ma ha
Furu ya na anya nke ukwuu.
Nnem bu onwa na etiti na ala igbo,
Osuofia ezigbo na ala Nkporo.
Elu igwe nke ato ndi madu na
Ele anya ka nwa nke chukwu.
Nnem bu ude ocha, nnem amaka.
Nnem makarachara mmuo miri nma;
Pino-pino nwa na ezigbo.
(C) John Chizoba Vincent
Voice Of Vincent 2016
Copyright © John Chizoba Vincent | Year Posted 2016
Post Comments
Poetrysoup is an environment of encouragement and growth so only provide specific positive comments that indicate what you appreciate about the poem. Negative comments will result your account being banned.
Please
Login
to post a comment